Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 31:1 - Bible Nso

1 Ma ndi Filistia nēbuso Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n'iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n'ugwu Gilboa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼoge a, ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 31:1
10 Iomraidhean Croise  

Unu ugwu Gilboa, Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli: N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi, Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.


Nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya we si, Ọ dabataram inọ n'ugwu Gilboa, ma, le, Sọl nādabere n'ube-ya; ma, le, ub͕o-ala na ndi-nwe inyinya sosiri ya ike.


Ma Jonatan nwa Sọl nwere nwa-nwoke nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua. Ọ b͕ara arọ ise mb͕e akukọ Sọl na Jonatan siri na Jezreel bia, nwayi nāzù ya we kuru ya, b͕alaga: o rue, mb͕e ọ nēme ngwa ib͕alaga, na nwata ahu dara ada, we ghọ onye-ngwurọ. Aha-ya bu Mefiboshet.


Ma ọ buru na unu eme ihe ọjọ nāga n'iru, agēkpochapu unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu.


O rue, na mb͕e ahu, na ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ibuso Israel agha. Ekish we si Devid, Mara nke-ọma na mu ka i gēso pua ba n'ọmuma-ulo-ikwū, gi onwe-gi na ndikom-i.


Samuel we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēkweghi ka m'nọdu ndu, ime ka m'rigota? Sọl we si, Anọm na nkpà nke-uku; ndi Filistia nēbusokwam agha, ma Chineke ewezugawo Onwe-ya n'arum, Ọ dighi-azakwam ọzọ, ma ọ bu n'aka ndi-amuma ma-ọbu na nrọ: m'we kpọ gi, ka i we me ka m'mara ihe m'gēme.


Ọzọ kwa, Jehova gēnye Israel n'aka ndi Filistia tiyere gi: echi ka gi na umu-gi ndikom gānọye-kwa-ram: Jehova gēnye kwa ọmuma-ulo-ikwū Israel n'aka ndi Filistia.


Ndi Filistia we chikọta onwe-ha, bia, ma ulo-ikwū-ha na Shunem: Sọl we chikọta Israel nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Gilboa.


Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha nile rue Efek: Israel nāma kwa ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi nke di na Jezreel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan