Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 30:26 - Bible Nso

26 Devid we biarue Ziklag, zigara ndi-okenye Juda, bú ndi-eyì-ya, ufọdu nime ihe-nkwata, si, Le, ihe-ngọzi unu gēnwe sitere n'ihe-nkwata nke ndi-iro Jehova;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Mgbe ha rutere Ziklag, Devid weere ụfọdụ ihe ha kwatara nʼagha zigara ndị okenye Juda, ndị bụ ndị enyi ya, na-asị, “Lee onyinye ewetaara unu site nʼụfọdụ nʼime ihe anyị kwatara site nʼaka ndị iro Onyenwe anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 30:26
14 Iomraidhean Croise  

Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.


O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua;


O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.


Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ: Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ.


I rigoruwo n'ebe di elu; dọta usu ndi adọtara n'agha n'agha; I natawo onyinye di iche iche n'etiti madu, E, ọbuná n'etiti ndi nēwezuga onwe-ha, ka Ja, bú Chineke, we biri n'etiti ha.


Ma onye amara aha-ya ezubewo ihe amara aha-ha; onye ahu nēguzosi kwa ike n'ime ihe amara aha-ha.


Ya mere agurughi m na ọ di nkpà iriọ umu-nna-ayi, ka ha buru uzọ jekuru unu, buru kwa uzọ me ka ihe-ngọzi ahu nke unu buru uzọ kwe na nkwa zu okè, ka ihe ahu we buru ihe edoziri, dika ihe-ngọzi, ọ bughi kwa dika ihe-nrib͕u.


Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya.


Ma ub͕u a ngọzi a nke nwayi nējere gi ozi wetaworo onye-nwem, ka enye ya umu-okorọbia ndi nēso onye-nwem n'ukwu n'ukwu jeghari.


Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n'ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n'ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n'aru gi ubọchi-gi nile.


Devid we chiri ìgwè ewu na aturu nile na ìgwè ehi; ha dupuru ha n'iru anu-ulo ndia, si, Nka bu ihe-nkwata Devid.


O rue, site n'ubọchi ahu we ga n'iru, na o doro ya ibu ukpuru na ibu ikpé nye Israel, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan