Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 30:22 - Bible Nso

22 Ndikom ọjọ nile na ndi jọb͕uru onwe-ha, n'etiti ndi soro Devid je, we za, si, N'ihi na ha esoghi ayi je, ayi agaghi-enye kwa ha ihe ọ bula nime ihe-nkwata nke ayi naputara, ma-ọbughi inye nwoke ọ bula nwunye-ya na umu-ya, ka ha we duru ha, la.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ma ndị ikom ọjọọ ahụ niile, na ndị okwu na ụka nọ nʼetiti ndị na-eso Devid sịrị, “Nʼihi na ndị a esoghị anyị jee, ya mere ha agaghị eso anyị keta ihe ndị a anyị kwatara nʼagha. Nyeghachi ha naanị nwunye ha na ụmụ ha; gwakwa ha ka ha laa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 30:22
10 Iomraidhean Croise  

me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.


Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.


Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n'ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke.


Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);


Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.


Ha we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, bú nwoke ọ bula nke nọ na nkpab͕u, na nwoke ọ bula nke nwere onye ọ nara ego n'ọmuru-nwa, na nwoke ọ bula nkpuru-obi-ya di ilu; o we buru onye-isi-ha: ihe ra ka nnù ndikom we nọ n'aka-ya.


Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.


Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.


Devid we biakute ọgu ndikom iri ahu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi ijeso Devid n'azu, ndi ha me-kwa-ra ka ha nọdu n'akuku miri-iyi Besoa: ha we puta izute Devid, na izute ndi ya na ha nọ: Devid we biarue nso ndi ahu, jua ha ajuju bayere udo-ha.


Devid we si, Umu-nnem, ihe Jehova nyere ayi, bú Onye debere ayi, nye kwa n'aka-ayi usu ahu ndi nāpunara madu ihe, ndi biara imegide ayi, unu agaghi-ewere ihe ahu me otú a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan