Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 30:17 - Bible Nso

17 Devid we tib͕ue ha site n'ururuchi we rue anyasi echi-ya: ọ dighi kwa otù nwoke nime ha wepugara onwe-ya, ma-ọbughi nnù umu-okorọbia, ndi nọkwasiri na camel-ha, we b͕alaga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Devid na ndị agha ya bịakwasịrị ha na mberede gbuo ha site nʼabalị ahụ ruo anyasị echi ya. Ọ dịkwaghị otu nwoke nʼime ha fọdụrụ ndụ ma ọ bụghị narị ndị ikom anọ makwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel ha gbalaga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 30:17
11 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua;


site na Siria, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek, site kwa n'ihe-nkwata Hedadeza, nwa Rehob, bú eze Zoba.


Ha we bilie n'ururuchi, ibà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ha we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu.


Ha we tib͕ue ndi fọduru n'etiti ndi Amalek b͕apuru ab͕apu, ha we biri n'ebe ahu, rue ta.


Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe: Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.


Ma Ishmael nwa Netanaia chiri ndikom asatọ wepuga onwe-ya n'aka Johanan, jekuru umu Amon.


Ma Berak churu ub͕ọ-ala-ya nile n'azu, na n'azu ọmuma-ulo-ikwū-ya, rue Haroshet nke mba di iche iche ọzọ: ọmuma-ulo-ikwū nile nke Sisera we da n'ọnu mma-agha; ọ dighi otù nwoke fọduru.


Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n'uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba.


O rue, n'echi-ya, na Sọl doro ndi Israel n'usu atọ; ha we ba n'etiti ọmuma-ulo-ikwū n'iche-nche ututu, tib͕ue Amon rue ikpo-ọku nke ehihie: o rue, na ndi fọduru b͕asara, ọ fọdughi kwa ndikom abua n'otù ebe n'etiti ha.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan