Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 30:15 - Bible Nso

15 Devid we si ya, Ì gēme ka m'ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe? Ọ si, Were Chineke ṅuaram iyi, na i gaghi-eme ka m'nwua, na i gaghi-emechibidokwam nye n'aka onye-nwem, m'gēme kwa ka i ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Devid jụrụ ya sị, “I nwere ike duru m gaa ebe ha nọ.” Nwokorobịa ahụ zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke na ị gaghị egbu m maọbụ were m nyeghachi onyenwe m, aga m eduru gị gaa ebe ha nọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 30:15
12 Iomraidhean Croise  

m'gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'etiti ha:


o we were otù onye sitere na nkpuru ala-eze ahu, ya na ya we b͕a ndu; o we me ka ọ ba n'ọb͕ub͕a-iyi, ọ bu kwa ndi nile di ike nke ala-ya ka ọ chiri:


Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ebe eze ahu bi nke meworo ya eze, bú onye o ledara ọb͕ub͕a-iyi-ya, onye o mebi-kwa-ra ọb͕ub͕a-ndu-ya, n'ebe ọ nọ n'etiti Babilon ka ọ gānwu.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ọb͕ub͕a-iyim nke o ledaworo, na ọb͕ub͕a-ndum nke o mebiworo, M'gātukwasi kwa ya n'isi-ya.


Ma ub͕u a, biko, werenu Jehova ṅuaram iyi, n'ihi na emerem unu ebere, na unu, ọbuná unu onwe-unu, gēmere ulo nnam ebere, nyekwam ihe-iriba-ama ezi-okwu:


Joshua we me ka udo di n'etiti ha na Israel, ya na ha we b͕a ndu, ka ọ kwe ka ha di ndu: ndi-isi nzukọ Israel we ṅuara ha iyi.


Ndi nēche nche we hu otù nwoke ka o nēsi n'obodo ahu puta, ha we si ya, Biko, gosi ayi nbata obodo a, ayi gēme-kwa-ra gi ebere.


Ekish we kpọ Devid, si ya, Jehova nādi ndu, n'ezie onye ziri ezi ka i bu: ọpupu-gi na nbata-gi n'ọmuma-ulo-ikwū n'akam di kwa nma n'anyam: n'ihi na ahutaghm ihe ọjọ n'aru gi site n'ubọchi i biakuterem rue ta: ma n'anya ndi-isi onye nādighi nma ka i bu.


Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n'ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n'ọku.


O we me ka ọ rida, ma, le, ha ab͕asawo n'iru ala ahu nile, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ememe, n'ihi ihe-nkwata uku nile nke ha kwatara n'ala ndi Filistia, na n'ala Juda.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan