Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 30:1 - Bible Nso

1 O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n'ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n'ọku,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe Devid na ndị ikom ya rutere obodo Ziklag nʼụbọchị nke atọ, ha hụrụ na ndị Amalek abịala wakporo bi nʼakụkụ ndịda Negev na Ziklag. Ha buru agha megide Ziklag, gbaa obodo ahụ ọkụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 30:1
18 Iomraidhean Croise  

Ma Aisak biarari site n'ije Bia-lahai-roi; n'ihi na ya onwe-ya bi n'ala Negeb.


O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua;


o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala.


Ọ sim, Ònye ka i bu? M'we si ya, Onye Amalek ka m'bu.


Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n'akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n'ukwu n'ukwu, nāgabiga kwa n'iru eze.


Ndi ahu ye-kwa-ra Devid aka imegide usu ndi nāpunara madu ihe: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha nile bu, ha we buru ndi-isi n'usu-ndi-agha.


N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.


ha we chiri ndikom-ha nile, je ibuso Ishmael nwa Netanaia agha, ha we chọta ya n'akuku miri bara uba nke di na Gibeon.


Jehova we si Joshua, Atula egwu n'ihi ha: n'ihi na echi dika na mb͕e a Mu onwem gāra ha nile nye ka ha buru ndi eb͕uru eb͕u n'iru Israel: nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha ka i gēbipu, ọ bu kwa ub͕ọ-ala nile ha ka i gēsure n'ọku.


na Ziklag, na Madmana, na Sansana;


Sọl we tib͕ue Amalek, site na Havila ebe i nābà Shua, nke di n'iru Ijipt.


Ọ we nwude Egag, bú eze Amalek, na ndu, were ọnu mma-agha wezuga ndi ahu nile ka ebibie ha.


Ekish we nye ya Ziklag n'ubọchi ahu: n'ihi ya ndi-eze Juda nwe Ziklag rue ta.


Ma ub͕u a bilie n'isi-ututu, gi na ndi-orù onye-nwe-gi ndi soro gi bia: mb͕e unu biliri n'isi-ututu, mb͕e ìhè diri unu, laghachi-kwa-nu.


Devid we bilie n'isi-ututu, ya onwe-ya na ndikom-ya, ila n'ututu, ilaghachi n'ala ndi Filistia. Ndi Filistia we rigo rue Jezreel.


Ma ndi-isi ndi Filistia were iwe megide ya; ndi-isi ndi Filistia we si ya, Me ka nwoke a laghachi, ka o we laghachi n'ọnọdu-ya ebe i mere ka ọ buru onye-nlekọta-ya, ma ka ọ ghara iso ayi rida n'agha, ka o we ghara ighọrọ ayi onye-nmegide n'agha ahu: n'ihi na onye a gēji gini me ka ihe-ya tọ onye-nwe-ya utọ? ọ̀ gaghi-eji isi ndikom ndia?


Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n'ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n'ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan