Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 3:12 - Bible Nso

12 N'ubọchi ahu M'gēme ka okwu nile M'kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nʼoge ahụ aga m emezu ihe niile m kwuru megide Elayị na ezinaụlọ ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 3:12
11 Iomraidhean Croise  

anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, amiputawo mma-agham n'ọbọ-ya; ọ gaghi-alaghachi kwa ọzọ.


Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.


Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha; Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha: Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya? Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?


Elu-igwe na uwa gāgabiga: ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.


Ọ gēru kwa, na dika ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu biakwasiworo unu, otú a ka Jehova gēme ka ihe ọjọ ahu nile biakwasi unu, rue mb͕e Ọ gēkpochapu unu n'ezi ala nka nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu.


Aka umu Israel we nāga nēsi ike n'aru Jebin, bú eze Kenean, rue mb͕e ha bipuru Jebin, bú eze Kenean.


Ewe were ib͕e Chineke; umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nwukwara.


Onye ahu nke nēzì ozi ahu we za, si, Israel ab͕alagawo n'iru ndi Filistia, ọzọ kwa, oké ntib͕u adiwo n'etiti ndi Israel, ọzọ kwa, umu-gi ndikom abua, bú Họfnai na Finehas, anwuwo, ewerewo kwa ib͕e Chineke.


O we kpọ aha nwa ahu Ikabod, si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua: n'ihi owuwe ewere ib͕e Chineke, na n'ihi nna di-ya na di-ya.


O we si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua; n'ihi na ewerewo ib͕e Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan