Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 27:9 - Bible Nso

9 Devid we tib͕ue ala ahu, o meghi kwa ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ma ọ chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na inyinya-ibu, na camel, na uwe, laghachi, biakute Ekish.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 27:9
9 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi nke Jehova we hu ya n'akuku isi-iyi miri ahu di n'ọzara, n'akuku isi-iyi ahu di n'uzọ Shua.


Ha we biri site na Havila rue Shua nke di n'iru Ijipt, mb͕e i nēje Asiria: n'iru umu-nne-ya nile ka ọ dara ada.


Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.


Moses we me ka Israel si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n'ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n'ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri.


Ha we were ọnu mma-agha wezuga ihe nile di n'obodo ahu ka ebibie ya, ma nwoke ma nwayi, ma nwata ma okenye, na ehi, na aturu, na inyinya-ibu.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


Sọl we tib͕ue Amalek, site na Havila ebe i nābà Shua, nke di n'iru Ijipt.


Ọ we nwude Egag, bú eze Amalek, na ndu, were ọnu mma-agha wezuga ndi ahu nile ka ebibie ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan