Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 27:2 - Bible Nso

2 Devid we bilie, gabiga, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi nọ n'aka-ya, biakute Ekish nwa Maok, bú eze Gat.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ya mere, Devid na narị ndị ikom isii ya, na ezinaụlọ ha, biliri jekwuru Akish nwa Maok, eze ndị Gat.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 27:2
7 Iomraidhean Croise  

Ma ndia bu ndi nābiakute Devid rue Ziklag, mb͕e anọ̀ nēmechibido ya n'ihi Sọl nwa Kish: ndi ahu di kwa n'etiti ndi-dike-ya, ndi nēyere ya aka n'agha ahu.


Devid we bilie, b͕apu n'ubọchi ahu n'iru Sọl, bakuru Ekish, bú eze Gat.


Ndi-orù Ekish we si ya, Ọ̀ bughi Devid, bú eze ala ahu, bu nka? ọ̀ bughi ihe bayere nwoke a ka ha zaritara onwe-ha n'ite-egwú, si, Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri, Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?


Devid we si ndikom-ya, Kenu, nwoke ọ bula mma-agha-ya n'úkwù-ya. Ha we ke, nwoke ọ bula mma-agha-ya, n'úkwù; Devid we ke kwa mma-agha-ya n'úkwù: ihe ra ka nnù ndikom we soro Devid n'azu rigo; ọgu ndikom iri we nọdu n'ebe ihe-ha di.


Devid we jua Jehova ase, si, Ọ buru na achuam usu a ndi nāpunara madu ihe n'azu, #m'gēru ha aru? Ọ si ya, Chua: n'ihi na i ghaghi iru ha aru, i ghaghi kwa inaputa ha ihe nile.


Devid we je, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi soro ya, ọ biarue miri-iyi Besoa, ma ndi anārapu n'azu guzoro n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan