Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 26:5 - Bible Nso

5 Devid we bilie, biarue ebe Sọl mara ulo-ikwū-ya: Devid we hu ebe ahu, bú ebe Sọl nēdina, ya na Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya: ma Sọl nēdina n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, ndi Israel nānọ kwa n'ulo-ikwū buruburu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Emesịa, Devid pụrụ jeruo ebe Sọl mara ụlọ ikwu ya. Ọ hụrụ ebe Sọl na Abna nwa Nea, onyeisi agha dinara ala. Sọl dina nʼime ogige ụlọ ikwu ahụ, ndị agha ya dinakwara gburugburu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 26:5
10 Iomraidhean Croise  

Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.


Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.


Devid we bilie n'isi-ututu, rapu ìgwè ewu na aturu ahu n'aka onye nēdebe aturu, o we būru, je, dika Jesi nyere ya iwu: o we biarue ebe anēdebe ub͕ọ-ala, mb͕e usu-ndi-agha ndi nāpukuru usoro-agha nēti nkpu n'agha.


Ma mb͕e Sọl huru Devid ka ọ nāpu izute onye Filistia ahu, ọ siri Abnea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, Abnea, nwà onye ka nwa-okoro nka bu? Abnea we si, Nkpuru-obi-gi nādi ndu, eze, amaghm.


Devid we ziga ndi-nledo, mara na Sọl abiawo n'ebe o dozisiri onwe-ya.


Ma otù nwoke Benjamin di, aha-ya bu Kish, nwa Abiel, nwa Zeroa, nwa Bekorat, nwa Afia, nwa onye Benjamin, bú dike nke bu dìnkpà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan