Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu.
Sọl we ma ulo-ikwū-ya n'ugwu ntà Hakila, nke di n'iru ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu, n'akuku uzọ. Ma Devid nānọdu n'ọzara, ọ hu na Sọl abiawo, nēso ya n'azu rue ọzara.
Devid we bilie, biarue ebe Sọl mara ulo-ikwū-ya: Devid we hu ebe ahu, bú ebe Sọl nēdina, ya na Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya: ma Sọl nēdina n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, ndi Israel nānọ kwa n'ulo-ikwū buruburu ya.