Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 26:21 - Bible Nso

21 Sọl we si, Emehiewom: lata, nwam Devid: n'ihi na m'gaghi-emejọ gi ọzọ, n'ihi na ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi ta: le, emewom ihe-nzuzu, me kwa ihe nke-uku ri nne n'amaghi-ama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Emehiela m. Lọghachi nʼụlọ nwa m Devid. Nʼihi na ị gụrụ ndụ m taa dịka ihe dị oke ọnụahịa. Agaghị m emejọ gị ọzọ. Nʼezie, a kpaala m agwa dịka onye nzuzu, meekwa ihe nke ukwuu na-amaghị ama.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 26:21
16 Iomraidhean Croise  

Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n'ala n'iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n'anya-gi.


Le, ọku siri n'elu-igwe ridata, ripia ndi-isi abua mbu ahu nke ọgu ndi-agha abua na iri, ha na ọgu ndi-agha abua na iri ha: ma ub͕u a ka ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi.


Ihe di oké ọnu-ahia n'anya Jehova Ka ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu.


(N'ihi na nb͕aputa nkpuru-obi-ha di oké ọnu-ahia, Ọ gāra kwa ya aka rue mb͕e ebighi-ebi:)


Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha; Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya.


Fero we zìe, kpọ Moses na Eron, si ha, Emehiewom ub͕u a: Jehova bu onye ezi omume, ma mu onwem na ndim bu ndi nēmebi iwu.


Belam we si mọ-ozi nke Jehova, Emehiewom; n'ihi na amaghm na gi onwe-gi nēguzo onwe-gi izutem n'uzọ: ma ub͕u a, ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-gi, m'gālaghachi n'onwem.


si, Emehierem n'irara ọbara Onye ikpé nāmaghi nye. Ma ha siri, Òle nke diri ayi nime ya? gi onwe-gi le nke ahu.


Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, bú nke O nyere gi n'iwu: n'ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n'ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Sọl we si Samuel, Emehiewom: n'ihi na agabigawom okwu-ọnu Jehova na okwu-gi nile: n'ihi na aturum egwu ndi Israel, we ge nti olu-ha.


O we si, Emehiewom: biko, sọpurum ub͕u a n'iru ndi-okenye ndim, na n'iru Israel; sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova, bú Chineke-gi.


Ndi-isi ndi Filistia we puta: o rue, mb͕e ọ bula ha nāputa, na Devid nwere uche kari ndi-orù nile nke Sọl; aha-ya we di oké ọnu-ahia nke-uku.


Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.


Devid we za, si, Le, ube-gi, eze! ka otù onye nime umu-okorọbia feta kwa, were ya.


Ma, le, dika ndu-gi di uku ta n'anyam, ka ndum di uku otú a n'anya Jehova, ka Ọ naputakwam na nkpab͕u nile.


Ewe gosi Sọl na Devid ab͕alagawo rue Gat: o we ghara ichọ ya ọzọ ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan