Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 26:16 - Bible Nso

16 Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n'ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n'akuku isi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 26:16
11 Iomraidhean Croise  

Iwe Devid we di ọku nke-uku megide nwoke ahu; o we si Netan, Jehova nādi ndu, n'ezie onye kwesiri ọnwu ka nwoke ahu bu nke nēme ihe a:


N'ihi na ulo nnam nile abughi ihe ọ bula ma-ọbughi ndi ọnwu n'iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi. Ma èzi omume gini ka m'nwere ọzọ itiku eze nkpu ọzọ?


Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n'Anatot, rue ubi-gi; n'ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m'gaghi-eme ka i nwua n'ubọchi ta, n'ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n'iru Devid, bú nnam, na n'ihi na ewedara gi n'ala n'ihe nile nke ewedara nnam n'ala nime ya.


Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ; Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu;


Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n'iru Gi; Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu;


ndi ayi onwe-ayi nile bi-kwa-ra obi n'etiti ha n'oge gara aga nime agu ihe ọjọ nke anu-aru-ayi, nēme ihe nile anu-aru-ayi na èchìchè-uche-ayi chọrọ, buru kwa umu nke iwe dika esi mu ayi, dika ndi fọduru bu kwa:


N'ihi na ubọchi nile nwa Jesi di ndu n'elu ala, agaghi-eme ka gi onwe-gi ma-ọbu ala-eze-gi guzosie ike. Ma ub͕u a ziga kutaram ya, n'ihi na onye kwesiri ọnwu ka ọ bu.


Ọ si ndikom-ya, Ya burum ihe-árú site na Jehova; m'gaghi-eme onye-nwem, bú onye Jehova etere manu, ihe a ma-ọli, bú iseti akam megide ya, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.


Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n'akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la.


Devid we si Abnea, Ọ̀ bughi nwoke ka i bu? ònye di kwa ka gi n'Israel? n'ìhi gini kwa ka i nēdebeghi onye-nwe-gi, bú eze, nke-ọma? n'ihi na otù onye nime ndi Israel batara ibibi eze, bú onye-nwe-gi.


Devid we si Abishai, Ebibila ya: n'ihi na ònye ka ikpe nāmaghi n'iseti aka-ya megide onye Jehova etere manu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan