Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 25:38 - Bible Nso

38 O rue, mb͕e ihe ra ka ubọchi iri gabigara, na Jehova tib͕uru Nebal, o we nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

38 Mgbe abalị iri gafere, Onyenwe anyị tiri Nebal ihe otiti, nke mere ka ọ nwụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 25:38
13 Iomraidhean Croise  

Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.


Jehova we tie eze ahu ihe, o we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche. Ma Jotam nwa eze bu onye-isi ulo-ya, nēkpe ndi ala ahu ikpe.


O rue, n'abali ahu, na mọ-ozi nke Jehova puru, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Chineke, ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Ọ gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo.


Jeroboam enweghi kwa ike ọzọ n'ubọchi Abaija: Jehova we tib͕ue ya, o we nwua.


I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji; I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume, We laghachi n'ájá-ha.


Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya? Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche.


O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu.


Ngwa ngwa mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we tie ya ihe, n'ihi na ọ nyeghi Chineke otuto ahu: ikpuru we tab͕ue ya, o we kubìe ume.


ihe agọziri agọzi ka ezi uche-gi bu kwa, onye agọziri agọzi ka i bu kwa, onye b͕ochiworom ta ka m'ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka akam ghara kwa izọputam.


O rue, n'ututu, mb͕e manya-vine puworo n'anya Nebal, na nwunye-ya gosiri ya okwu ndia, obi-ya we nwua n'etiti ya, ya onwe-ya we di ka nkume.


Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n'agha, ewe kpochapu ya.


Le-kwa-nu, ọ buru na ọ rigo n'uzọ ókè-ala-ya rue Bet-shemesh, Ya onwe-ya emewo ayi oké ihe ọjọ a: ma ọ buru na ọ rigoghi otú a, ayi gāma kwa na ọ bughi aka-Ya tib͕uru ayi; ihe-ndabà ka ihe ahu bu, nke dabara ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan