Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 25:29 - Bible Nso

29 Ọ bu kwa ezie na madu biliri ichu gi, na ichọ nkpuru-obi-gi: ma agēke nkpuru-obi onye-nwem na ngugu nke ndi di ndu n'aka Jehova, bú Chineke-gi; ma nkpuru-obi ndi-iro-gi, ha ka Ọ gēsi n'etiti oghere èbè-Ya mapu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ị na-achụ gị ịnapụ gị ndụ gị, ma ndụ onyenwe m ga-abụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị ga-ekechi na ngwungwu ndị dị ndụ. Ma ndụ ndị iro gị ka ọ ga-atụfu dịka nkume esi nʼakpa e ji efe ebe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 25:29
17 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n'ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku.


Ha we butere Devid isi Ish-boshet rue Hebron, si eze, Le, isi Ish-boshet nwa Sọl, bú onye-iro-gi, nke chọrọ ndu-gi; ma Jehova abọworo onye-nwem, bú eze, ọ́bọ̀ ta n'aru Sọl, na n'aru nkpuru ya.


Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya: N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.


Ihe di oké ọnu-ahia n'anya Jehova Ka ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu.


N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem, Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim: Ha edoghi Chineke n'iru ha. Selah


Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu, Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.


N'ihi na otú a ka jehova siri, Le, M'gaje imapu ndi bi n'ala nka dika èbè na mb͕e a, M'gākpab͕u kwa ha, ka ha we chọputa ha.


Ha gābu kwa nkem, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, n'ubọchi ahu mḅe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam; M'gēnwe kwa ọmiko n'aru ha, dika madu si enwe ọmiko n'aru nwa-ya nke nēfè ya.


Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: unu onwe-unu gādi kwa ndu, n'ihi na Mu onwem nādi ndu.


ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem.


Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n'anya, dika I hurum n'anya.


Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel: Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo, Onye bu ọta nke iye-aka-gi, Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi! Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi; Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.


ndi ewere ike nke Chineke nēche nche site n'okwukwe rue nzọputa nke edoziworo ikpughe n'oge ikpe-azu.


Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe, Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri; N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan