Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 25:27 - Bible Nso

27 Ma ub͕u a ngọzi a nke nwayi nējere gi ozi wetaworo onye-nwem, ka enye ya umu-okorọbia ndi nēso onye-nwem n'ukwu n'ukwu jeghari.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ma kwerekwa ka onyinye a, nke ohu gị nwanyị wetaara nna m ukwu, bụrụ nke a ga-enye ndị ikom na-eso gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 25:27
8 Iomraidhean Croise  

Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.


Eze we si Ziba, Gina ka i gēji ihe ndia me? Ziba we si, Inyinya-ibu ndia bu ka ndi ulo eze we nọkwasi ha; achicha na nkpuru mb͕e okpom-ọku bu ka umu-okorọbia we rie ha; manya-vine bu ka ndi nāda mbà nọzara we ṅua.


O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.


Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara, Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.


Ya mere agurughi m na ọ di nkpà iriọ umu-nna-ayi, ka ha buru uzọ jekuru unu, buru kwa uzọ me ka ihe-ngọzi ahu nke unu buru uzọ kwe na nkwa zu okè, ka ihe ahu we buru ihe edoziri, dika ihe-ngọzi, ọ bughi kwa dika ihe-nrib͕u.


Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo.


Abigail we me ngwa, bilie, nọkwasi n'inyinya-ibu, ya na umu-ab͕ọghọ-ya ise ndi nējeso ya n'ukwu n'ukwu; o we nējeso ndi-ozi Devid n'azu, ghọrọ ya nwunye.


Devid we biarue Ziklag, zigara ndi-okenye Juda, bú ndi-eyì-ya, ufọdu nime ihe-nkwata, si, Le, ihe-ngọzi unu gēnwe sitere n'ihe-nkwata nke ndi-iro Jehova;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan