Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 25:26 - Bible Nso

26 Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Ugbu a, onyenwe m, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ ma gị onwe gị na-adịkwa ndụ, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbochiri gị ka ị ghara ịba nʼikpe ọmụma nke igbu mmadụ, na iji aka gị bọrọ onwe gị ọbọ, ka ndụ ndị iro gị na ndị niile na-achọ ime onyenwe m ihe ọjọọ, dịka Nebal.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 25:26
20 Iomraidhean Croise  

Chineke we si ya nime nrọ ahu, Mu onwem kwa, amawom na ọ bu n'izu-okè nke obi-gi ka i meworo nka, Mu onwem we b͕ochi kwa gi ka i ghara ime-hie megidem: n'ihi ya ekweghm i metu ya aka.


Eze we si onye Kush ahu, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom? Onye Kush we si, Ndi-iro onye-nwem, bú eze, na ndi nile ndi biliworo megide gi imejọ gi, ka ha di ka nwa-okorọbia ahu.


Elaija we si Elaisha, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Bet-el, Elaisha we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we ridarue Bet-el.


O rue, mb͕e ihe nile juru, na ọ siri nwa-ya, Buterem nso ihe ọzọ. Ọ si ya, Ọ dighi ihe ọzọ di. Manu ahu we kwusi.


N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu, Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha: Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi, N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ.


Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ, Ubọchi nile nke ndu-ya.


agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n'ọku:


Mb͕e ahu o juru Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, anya nwa mb͕e, èchìchè-ya nile we me ka ọ ma jijiji. Eze zara, si, Belteshaza, ekwela ka nrọ a ma-ọbu akukọ-isi-ya me ka i ma jijiji. Belteshaza zara, si, Onye-nwem, ka nrọ a diri ndi nākpọ gi asì, ka akukọ-isi-ya di-kwa-ra ndi-iro-gi.


N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé.


Hana we si, Biko, onyenwe m, nkpuru-obi-gi nādi ndu, onyenwe m, Mu onwem bu nwayi ahu nke guzoro onwe-ya nso gi n'ebe a, ikpere Jehova.


Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe, Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri; N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.


Jonatan na ulo Devid we b͕a ndu, si, Jehova gājuta ya n'aka ndi-iro Devid.


Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu.


Devid we si n'ebe ahu je rue Mizpe Moab: ọ si eze Moab, Biko, ka nnam na nnem puta, nọ n'etiti unu, rue mb͕e m'mara ihe Chineke gēmerem.


Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.


Devid we nu na Nebal anwuruwo, ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye kpere ọnu ihe-ita-utam n'ikpé, me ka m'pua n'aka Nebal, O we b͕ochie orù-Ya ka ọ ghara ime ihe ọjọ: ma ihe ọjọ Nebal ka Jehova meworo ka ọ lata n'isi-ya. Devid we ziga kwue okwu bayere Abigail, iluta ya n'onwe-ya na nwunye.


Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n'agha, ewe kpochapu ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan