Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 25:25 - Bible Nso

25 Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Nebal bụ nwoke nwere obi ọjọọ, biko ka onyenwe m ghara ịgụ ihe ọbụla o kwuru nʼihe. Ọ bụ onye nzuzu, dịka aha ya na-egosi. Aha ya pụtara nzuzu, nzuzu na-esokwa ya. Ma ahụghị m ndị ozi ahụ i zitere, nʼezie ohu gị ahụghị ndị ikom onyenwe m zitere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 25:25
9 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a ka onye-nwem, bú eze, ghara ido okwu a n'obi-ya, si, Umu-ndikom eze nile anwuwo, n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu.


Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike: Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.


Agaghi-akpọ kwa onye-nzuzu onye amara aha-ya ọzọ, agaghi-asi kwa na onye-aghughọ bu ọgaranya.


O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.


Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.


Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.


O we da n'ala n'ukwu-ya, si, Onye-nwem, ka ajọ omume ahu dikwasi mu onwem: ma biko, ka orù-gi nwayi kwue na nti-gi, gi nuru kwa okwu nile nke orù-gi nwayi.


Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.


Ma aha nwoke ahu bu Nebal; aha nwunye-ya bu Abigail: nwayi ahu nwere ezi uche, ma kwa nma n'aru: ma nwoke ahu siri ike n'obi, jọ kwa njọ n'omume nile; ya onwe-ya bu kwa onye Keleb.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan