Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 25:23 - Bible Nso

23 Abigail we hu Devid, me ngwa, si n'inyinya-ibu-ya rida, da kpue iru-ya n'ala n'iru Devid, kpọ isi ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Mgbe Abigel hụrụ Devid, o mere ngwangwa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịda, kpuo ihu nʼala, kpọọ isiala nye Devid.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 25:23
12 Iomraidhean Croise  

o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala.


Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.


Ahimaaz we kpọ òkù, si eze, Udo. Ọ kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke-gi, bu, Onye mechibidoworo ndikom ahu ndi weliri aka-ha imegide onye-nwem, bú eze.


Mefiboshet, nwa Jonatan, nwa Sọl, we biakute Devid, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala. Devid we si, Mefiboshet, Ọ si, Le orù-gi!


Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n'ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n'ala.


O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?


O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa we si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?


Rut we da kpue iru-ya n>ala, kpọ isi ala, si ya, Gini mere m>hutaworo amara n>iru gi, i we matam, ebe mu onwem bu ọb#ia?


Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá.


Devid we bilie ka emesiri, si n'ọb͕à ahu pua, kpọ òkù n'azu Sọl, si, Onye-nwem eze. Sọl we legide anya n'azu-ya, Devid we rube iru-ya n'ala, kpọ isi ala.


O we da n'ala n'ukwu-ya, si, Onye-nwem, ka ajọ omume ahu dikwasi mu onwem: ma biko, ka orù-gi nwayi kwue na nti-gi, gi nuru kwa okwu nile nke orù-gi nwayi.


O we bilie, kpọ isi ala, kpue iru-ya n'ala, si, Le, orù-gi nwayi bu nwayi nēje ozi isa ukwu ndi-orù onye-nwem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan