Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 25:19 - Bible Nso

19 Ọ we si umu-okorọbia-ya, Gabiganu n'irum; le, m'nābia n'azu unu. Ma o gosighi di-ya, bú Nebal.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ọ sịrị ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, “Na-aganụ nʼihu, ana m abịa nʼazụ.” Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ na-aga ime.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 25:19
9 Iomraidhean Croise  

Ọ nye ha n'aka ndi-orù-ya, n'ìgwè ichè; ọ si ndi-orù-ya, Gabiganu n'irum, me kwa mbara n'etiti ìgwè na ìgwè.


Ọ nye kwa onye nke-abua, na onye nke-atọ, na ndi nile nēso ìgwè nile, iwu, si, Dika okwu a si di ka unu gāgwa Isọ, mb͕e unu huru ya;


unu gāsi kwa, Ọzọ, le, orù-gi Jekob nọ n'azu ayi. N'ihi na ọ siri, Ka m'were onyinye-inata-iru-ọma nka nke nāga n'irum kpuchie anya-ya, emesia m'gāhu iru-ya; eleghi anya ọ gāhum iru-ọma.


Onyinye ahu inata iru-ọma we gabiga n'iru ya: ma ya onwe-ya nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū-ya abali ahu.


Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma, Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.


Ubọchi we rue mb͕e Jonatan nwa Sọl siri nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, nke di n'ofè ọzọ ahu. Ma o gosighi nna-ya.


O rue, mb͕e inyinya-ibu nēbu nwayi ahu ga, mb͕e ọ nārida kwa n'ebe-nzuzo nke ugwu ahu, le, Devid na ndikom-ya nārida izute ya; o we zute ha.


Abigail we biakute Nebal; ma, le, o nwere oké oriri n'ulo-ya, dika oké oriri eze; obi Nebal we di nma nime ya, ọ ṅubiga-kwa-ra manya okè nke-uku: Abigail we ghara igosi ya okwu ọ bula, okwu ntà ma-ọbu okwu uku, rue ìhè ututu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan