Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 25:17 - Bible Nso

17 Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 25:17
19 Iomraidhean Croise  

Gad we biakute Devid, si, ya, Ọ̀ bu oké unwu arọ asa gābiakute gi n'ala-gi? mà-ọbu na i ganāb͕alaga n'iru ndi nākpab͕u gi ọnwa atọ, mb͕e ndi ahu nāchu gi: mà-ọbu na ajọ ọria nēfe efe gādi n'ala-gi ubọchi atọ? ub͕u a mata, le kwa okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.


me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.


Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.


Ndikom efu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, b͕a onwe-ha ume imegide Rehoboam nwa Solomon, ma Rehoboam bu nwata di kwa nrò n'obi, o meghi kwa onwe-ya ka ọ di ike n'iru ha.


O rue, mb͕e ọ nāgwa ya okwu, na eze siri ya, Ọ̀ bu iburu eze onye nādu ọdu ka ayi meworo gi? ra aka; n'ìhi gini ka agētib͕u gi? Onye-amuma ahu we ra aka, si, Amawom na Chineke ezubewo ibibi gi, n'ihi na i mewo nka, i geghi kwa idu-ọdum nti.


Eze we si n'ọṅuṅu manya-vine bilie n'ọnuma-ya je n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n'aka Esta, bú nwunye eze; n'ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya.


Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.


Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);


Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.


Ma ufọdu ndi jọb͕uru onwe-ha siri, Onye a, ò gēsi aṅa zọputa ayi? Ha we lelia ya, ha ewetaghi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma. O we di ka onye nti chiri.


Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.


Ọ buru na ọ si otú a, Ọ di nma; udo gādiri orù-gi: ma ọ buru na iwe-ya di ọku nke-uku, mara na o zubesiri ihe ọjọ a ike.


Jonatan we si, Ya buru gi ihe-árú: n'ihi na ọ buru na amaram n'ezie na nnam zubesiri ike ka ihe ọjọ a biakwasi gi, #m'gaghi-egosi kwa gi ya?


ha buru ayi mb͕idi ma abali ma ehihie, ubọchi nile ayi na ha nọ mb͕e ayi nāzù ìgwè ewu na aturu.


Abigail we me ngwa, chiri ọgu ob͕e achicha iri, na karama-akpukpọ abua nke manya-vine juru nime ha, na aturu ise edoziri edozi, na mb͕é ọka aṅara aṅa ise, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu mbadamba fig iri, we bo ha inyinya-ibu.


Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan