Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 24:21 - Bible Nso

21 Ma ub͕u a were Jehova ṅuaram iyi, na i gaghi-ebipu nkpurum gānọchim n'azu, na i gaghi-ekpochapu aham n'ulo nnam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Biko, ṅụọra m iyi nʼaha Onyenwe anyị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 24:21
9 Iomraidhean Croise  

ma ub͕u a were Chineke ṅuaram iyi n'ebe a na i gaghi-agwa mu onwem, ma-ọbu umum, ma-ọbu umu umum, okwu-ugha: ọ bu dika ebere nke m'meworo gi si di ka i gēmerem, mekwaram ala nke i nọworo dika ọbìa nime ya.


Leban we si, Obo a bu ihe-àmà n'etiti mu na gi ta. N'ihi nka akpọrọ aha-ya Galeed:


Chineke nke Abraham, na Chineke nke Nehoa, bú Chineke nke nna-ha, kpe ikpe n'etiti ayi. Jekob we were Oké Egwù nke nna-ya Aisak ṅua iyi.


N'ihi na madu ji onye ka ha uku aṅu iyi: iṅu-iyi bu-kwa-ra ha nkwubì-okwu nke okwu ọ bula, ime ka o guzosie ike.


Ọ si ya, Atula egwu: n'ihi na aka nnam, bú Sọl, agaghi-achọta gi; gi onwe-gi gābu kwa eze Israel, mu onwem gābu-kwa-ra gi onye nke-abua; ọzọ kwa, Sọl, bú nnam, mara nka.


Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n'ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n'ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n'aru gi ubọchi-gi nile.


O gēru kwa, mb͕e Jehova gēmewori nye onye-nwem dika ezi ihe nile si di nke O kwuworo bayere gi, mb͕e Ọ gēnyewo kwa gi-ri iwu ibu onye-ndú Israel;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan