1 Samuel 23:7 - Bible Nso7 Ewe gosi Sọl na Devid abàwo na Keila. Sọl we si, Chineke ajuwo ya, rapu ya n'akam; n'ihi na emechibidowo ya nime, n'ibà n'obodo nwere ibo ọnu-uzọ-ama na nkpọrọ. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.” Faic an caibideil |