Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 23:6 - Bible Nso

6 O rue, mb͕e Abaiata nwa Ahimelek b͕akuru Devid rue Keila, na ọ chiri ephod n'aka-ya rida.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 (Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila).

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 23:6
12 Iomraidhean Croise  

Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n'Anatot, rue ubi-gi; n'ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m'gaghi-eme ka i nwua n'ubọchi ta, n'ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n'iru Devid, bú nnam, na n'ihi na ewedara gi n'ala n'ihe nile nke ewedara nnam n'ala nime ya.


Ha gēme kwa ephod ahu; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọ̀kà.


Sọl we si Ahaija, Bute ib͕e Chineke nso. N'ihi na ib͕e Chineke di n'etiti umu Israel n'ubọchi ahu.


Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo.


Ma otù nwa-nwoke nke Ahimelek nwa Ahaitub nwere, aha-ya bu Abaiata, wepugara onwe-ya, b͕apu soro Devid.


Devid we jua Jehova ase, si, M'gēje tib͕ue ndi Filistia ndia? Jehova we si Devid, Je, tib͕ue ndi Filistia, zọputa Keila.


Devid na ndikom-ya we jerue Keila, buso ndi Filistia agha, kpuru anu-ulo-ha, tib͕ue ha ntib͕u uku. Devid we zọputa ndi bi na Keila.


Ewe gosi Sọl na Devid abàwo na Keila. Sọl we si, Chineke ajuwo ya, rapu ya n'akam; n'ihi na emechibidowo ya nime, n'ibà n'obodo nwere ibo ọnu-uzọ-ama na nkpọrọ.


Devid we mara na ọ bu ya ka Sọl nēcheputa ihe ọjọ megide; o we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, Chita ephod nso.


Devid we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, bú nwa Ahimelek, Biko, chitaram ephod nso. Abaiata we chita ephod ahu nso n'ebe Devid nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan