Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 23:3 - Bible Nso

3 Ndikom Devid we si ya, Le, ayi onwe-ayi nātu egwu n'ebe a nime Juda: àyi gēsi kwa aṅa ghara itu egwu kari mb͕e ayi gēje Keila, rue usoro-agha nile nke ndi Filistia?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 23:3
7 Iomraidhean Croise  

Na Jehova ka m'b͕abàworo: Ùnu si aṅa si nkpuru-obim, Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu?


Asi na i so ndi ji ukwu eje b͕a ọsọ, ha we me ka ike gwu gi, ì gēsi kwa aṅa nu ọku n'obi ib͕akari inyinya? ọ bu kwa n'ala udo ka i nọ na ntukwasi-obi, ma ì gēsi aṅa me na nbili-elu nke Jọdan?


Devid we hu na Sọl aputawo ichọ ndu-ya: ma Devid nọ n'ọzara Zif n'oké ọhia.


Devid we jua Jehova ase, si, M'gēje tib͕ue ndi Filistia ndia? Jehova we si Devid, Je, tib͕ue ndi Filistia, zọputa Keila.


Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m'gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n'ala nka, na m'gāchọputa ya n'usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile.


Sọl we je n'otù akuku ugwu, Devid na ndikom-ya n'akuku nke-ọzọ nke ugwu ahu: Devid we zọlie ọsọsọ ib͕apu n'iru Sọl; ma Sọl na ndikom-ya nāb͕a Devid na ndikom-ya buruburu inwude ha.


Devid we ju kwa Jehova ase ọzọ. Jehova we za ya, si, Bilie, rida rue Keila; n'ihi na Mu onwem nēnye ndi Filistia n'aka-gi,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan