Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 23:26 - Bible Nso

26 Sọl we je n'otù akuku ugwu, Devid na ndikom-ya n'akuku nke-ọzọ nke ugwu ahu: Devid we zọlie ọsọsọ ib͕apu n'iru Sọl; ma Sọl na ndikom-ya nāb͕a Devid na ndikom-ya buruburu inwude ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, Sọl na ndị agha ya nọ nʼotu akụkụ ugwu ahụ, Devid na ndị agha ya nọkwa nʼakụkụ nke ọzọ, na-eme ngwa ka ha gbanarị Sọl. Ma Sọl na ndị agha ya na-abịa nnọọ nso ijide Devid.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 23:26
17 Iomraidhean Croise  

Devid we si ndi-orù-ya nile, ndi ya na ha nọ na Jerusalem, Bilienu, ka ayi b͕apu; n'ihi na ayi enweghi nb͕apu n'iru Absalom: menu ngwa ije, ka o we ghara ime ngwa rue ayi aru, me ka ihe ọjọ kwagide ayi, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo a.


Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n'ihi na ike adighi nime ayi n'iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.


Ub͕u a ha di ayi buruburu na nzọ-ukwu-ayi: Ha nēdo anya-ha ime ka ayi ruru ala.


Site n'iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe, Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu.


Ọtutu oke-ehi dim buruburu: Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu.


N'ihi na nkita dim buruburu: Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu; Ha nādupú akam abua na ukwum abua.


Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi: Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi.


N'ihi na, umu-nnam, ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere nkpab͕u-ayi nke akpab͕uru ayi n'Esia, na esob͕uru ayi nke-uku ri nne, kari ike-ayi, ya mere ayi nwebigara obi abua ókè ma ayi gādi kwa ndu:


Ha we rigo n'obodobo uwa, nọgide ọmuma-ulo-ikwū ndi nsọ gburugburu, ya na obodo ahu nke ahuworo n'anya: ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ha.


Ewe gwa ndi Geza, si, Samson abiawo ebe a. Ha we b͕a ya buruburu, che ya anwu abali ahu nile n'ọnu-uzọ-ama obodo, nọdu du abali ahu nile, si, Ka ọ di rue ìhè ututu, ayi we b͕ue ya.


Maikal we weda Devid site na window: o we je, b͕alaga, wepuga onwe-ya.


Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Me ngwa, je ọsọsọ, eguzola. Nwa-okoro Jonatan we chikọta àkú, biakute onye-nwe-ya.


Sọl na ndikom-ya we je ichọ ya. Ha we gosi Devid: o we rida rue nkume ahu di elu, nọdu n'ọzara Maon. Sọl we nu ya, chua Devid n'azu n'ọzara Maon.


Ma onye-ozi biakutere Sọl, si, Me ngwa, lata; n'ihi na ndi Filistia amadewo imegide ala-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan