Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 23:20 - Bible Nso

20 Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n'aka eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 23:20
11 Iomraidhean Croise  

Abnea we si Devid, Ka m'bilie je chikọtara onye-nwem, bú eze, Israel nile, ka gi na ha we b͕a ndu, ka i we buru kwa eze ndi nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike. Devid we zilaga Abnea, o we la n'udo.


Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe; Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa: Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.


N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem, Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim: Ha edoghi Chineke n'iru ha. Selah


Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe: Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe.


Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume; Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:


Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi: Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia.


Mb͕e onye Livai gābia site n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile site n'Israel nile, ebe ya onwe-ya nọ dika ọbìa, ọ we were agu nile nāgu nkpuru-obi-ya biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa;


Devid we si, Ndi-nwe Keila, hà gēmechibidom na ndikom nkem nye n'aka Sọl? Jehova we si, Ha gēmechibido gi nye.


Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n'ihi na unu enwewo ọmiko n'arum.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan