Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 23:12 - Bible Nso

12 Devid we si, Ndi-nwe Keila, hà gēmechibidom na ndikom nkem nye n'aka Sọl? Jehova we si, Ha gēmechibido gi nye.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?” Onyenwe anyị sịrị, “Ha ga-eme otu a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 23:12
12 Iomraidhean Croise  

Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi.


Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu; N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi: Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya; N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye.


I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro; I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.


Ọ bu nání Chineke ka nkpuru-obim nēdere du: N'aka-Ya ka nzọputam si bia.


Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?


Jehova me-kwa-ram ka m'mara ya, m'we mara ya: mb͕e ahu ka I mere ka m'hu omume nile ha.


Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.


Ndikom Juda we si, N'ìhi gini ka unu rigotaworo megide ayi? Ha si, Ike Samson ab͕u ka ayi rigotaworo, ime ya dika o meworo ayi.


Ndi-nwe Keila, ha gēmechibidom nye n'aka-ya? Sọl, ọ̀ gāridata, dika orù-Gi nuworo? Jehova, bú Chineke Israel, biko, gosi orù-Gi. Jehova we si, Ọ gāridata.


Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n'aka eze.


Ewe gosi Sọl na Devid abàwo na Keila. Sọl we si, Chineke ajuwo ya, rapu ya n'akam; n'ihi na emechibidowo ya nime, n'ibà n'obodo nwere ibo ọnu-uzọ-ama na nkpọrọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan