Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 22:18 - Bible Nso

18 Eze we si Doeg, Gi onwe-gi chigharia, dakwasi ndi-nchu-àjà. Doeg onye Edom we chigharia, ya onwe-ya we dakwasi ndi-nchu-àjà, me ka ọgu ndikom anọ na ise nwua n'ubọchi ahu, bú ndi nēyi ephod nke ákwà ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 22:18
14 Iomraidhean Croise  

Ha we kekọta onwe-ha imegide ya, were nkume tub͕ue ya, n'ihi ihe eze nyere n'iwu, n'ogige ulo Jehova.


Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha; Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.


Umu-ndikom Eron ka i geme-kwa-ra uwe-ime, me-kwa-ra ha ihe ike n'úkwù, ihe ike n'isi ka i gēme-kwa-ra ha, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma.


Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume; Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:


Onye anēmeb͕u emeb͕u ka Efraim bu, ọ bu onye anāzọpia n'ikpé; n'ihi na o kwere ijeso ihe enyere n'iwu.


Ha ji ihe ọjọ ha eme ka eze ṅuria, ji kwa okwu-ugha nile ha eme ka ndi-isi ṅuria.


N'ihi na anēdebe ukpuru nile nke Ọmri, na ọlu nile nke ulo Ehab, unu ewe jeghari nime ndum-ọdu nile ha: ka M'we me gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, me kwa ndi bi nime-ya ka ha ghọ ihe-ima-ọsọ; ọ bu kwa ita-uta ndim ka unu gēbu.


Ndi-isi-ya n'etiti ya bu ọdum nāb͕ọ uja; ndi-ikpe-ya bu anu-ọhia wolf nke anyasi; ha ekpechaghi ọkpukpu n'ututu.


Ma Samuel nēje ozi n'iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké.


Èsim n'ebo nile nke Israel rọputa ya iburum onye-nchu-àjà, irigo rue ebe-ichu-àjàm, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, iyiri ephod n'irum? ènye-kwa-ram ulo nna-gi àjà-ọku nile nke umu Israel?


Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'ulo-gi gābia ikpọ isi ala nye ya n'ihi ego ntà nke ọla-ọcha na ob͕e achicha, ọ gāsi kwa, Biko, tiyem n'otù uzọ ọlu-nchu-àjà, ka m'we rie iberibe achicha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan