Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 21:7 - Bible Nso

7 Ma otù nwoke n'etiti ndi-orù Sọl nọ n'ebe ahu n'ubọchi ahu, onye anēb͕ochi ka ọ ghara ipu n'iru Jehova; aha-ya bu Doeg, onye Edom, onye kachasi ike n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo ndi Sọl nwere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ma otu onye odibo Sọl nọ nʼebe ahụ nʼụbọchị ahụ, onye e jigidere nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ Doeg, onye Edọm onyeisi ndị na-azụ anụ ụlọ Sọl.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 21:7
21 Iomraidhean Croise  

Ndi-ọzùzù anu-ulo Gera we so ndi-ọzùzù anu-ulo Aisak nēse okwu, si, Ọ bu ayi nwe miri ahu: ọ kpọ aha olùlù-miri ahu Isek; n'ihi na ha chọrọ ya okwu.


onye-isi ìgwè ehi nke nāta nri nime Sheron bu Shitrai onye Sheron: onye-isi ìgwè ehi nke di nime ndagwurugwu nile bu Shefat nwa Adlai:


onye-isi ìgwè ewu na aturu bu Jaziz onye Haga. Ndia nile bu ndi-isi àkù nke Devid nwere.


O wu-kwa-ra ulo-elu ufọdu n'ọzara, gwue ọtutu olùlù-miri, n'ihi na o nwere ọtutu anu-ulo; ma n'ebe di ala ala, ma n'ebe di lari: o nwe-kwa-ra ndi-ọlu-ubi na ndi-ọlu-ubi-vine n'ugwu na nime Kamel; n'ihi na ọ bu onye huru ọlu ubi n'anya.


Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.


Ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe nsọ ahu: onye nānọdu n'ulo onye-nchu-àjà, ma-ọbu onye egoro ọlu agaghi-eri ihe nsọ ahu.


Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e ọ bu nwanyi di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi achupuru achupu, ma o nweghi nkpuru, o we laghachi n'ulo nna-ya, dika mb͕e ọ di na nwata, ihe nime nri nna-ya ka o gēri: ma ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe ọ bula nime ya.


Ọzọ, i gēwere utu ọka flour, sie ya ka ọ buru ob͕e achicha iri na abua: uzọ abua n'uzọ iri nke ephah gādiri otù ob͕e achicha.


Kwa-ubọchi-izu-ike o gēdo ya n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum; o sitere n'umu Israel, ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ bu.


si, Òle mb͕e ọnwa ọhu gāgabiga, ka ayi we re ọka? na ubọchi-izu-ike, ka ayi we cho ọka wheat? n'ime ka ọtùtù ephah di ntà, na ime ka ego shekel di uku, na ime ka ihe-ọtùtù aghughọ b͕agọrọ;


Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha; Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.


Ma, le, Sọl biara, nēso ìgwè ehi si n'ubi; Sọl we si, Gini nēme ndi Israel na ha nākwa ákwá? Ha we kọrọ ya okwu nile nke ndikom Jebesh.


Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha.


Devid we si Ahimelek, Ọ̀ dighi kwa ube ma-ọbu mma-agha di n'ebe a n'okpuru aka-gi? n'ihi na ewetaghm ma mma-agham ma ihe-agham, n'ihi na okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku.


O we juara ya ase n'aka Jehova, nye ya ihe ọ gēri n'uzọ, nye kwa ya mma-agha Gọlaiat onye Filistia.


Devid we si Abaiata, Amaram n'ubọchi ahu, mb͕e Doeg, bú onye Edom, nọ n'ebe ahu, na ọ ghaghi igosi Sọl: mu onwem akpatawo ọnwu nke madu nile nke ulo nna-gi.


Doeg onye Edom we za, (n'ihi na ya onwe-ya nēguzo n'akuku ndi-orù Sọl), si, Ahurum nwa Jesi ka ọ nābiaru Nob, biakute Ahimelek nwa Ahaitub.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan