Jehoiakim, bú eze, na ndi-dikei ya nile, na ndi-isi nile, we nu okwu-ya nile, eze we chọ ime ka ọ nwua; Uraia we nu ya, tua egwu, b͕alaga, we ba n'Ijipt:
Devid we b͕a ọsọ, guzo n'elu onye Filistia ahu, were mma-agha-ya, miputa ya n'ọbọ-ya, me ka ọ nwua, ọ were ya bipu isi-ya. Ndi Filistia we hu na dike-ha anwuwo, ha we b͕alaga.