40 Jonatan we nye nwa-okoro o nwere ihe-ya, si ya, La, chiri ha ba n'obodo.
40 Jonatan nyere nwokorobịa ahụ ụta ya na àkụ ndị ahụ ka ọ chighachi ha nʼobodo.
Ma nwa-okoro ahu amaghi ihe ọ bula: nání Jonatan na Devid mara okwu ahu.
Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá.