Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 20:1 - Bible Nso

1 Devid we si na Naiot nime Rema b͕alaga, ọ bia kwue n'iru Jonatan, si, Gini ka m'meworo? gini bu ajọ omumem? gini bu kwa nmehiem n'iru nna-gi, na ọ nāchọ ndum?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Devid sitere na Naịọt nʼime Rema gbapụ ọsọ, chọta Jonatan, sị ya, “Ọ bụ gịnị ka m mere? Gịnị bụkwa ihe ọjọọ m mere? Olee ụzọ m si mejọọ nna gị, mere o ji na-achọsi ike ka ọ napụ m ndụ m?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 20:1
19 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem, Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim: Ha edoghi Chineke n'iru ha. Selah


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;


Ndi m'huru n'anya, ọ buru na obi-ayi amaghi ayi ikpé, ayi nwere nkwuwa-okwu n'ebe Chineke nọ;


Lem: b͕agidem àmà n'iru Jehova, na n'iru onye nke Ya etere manu: ọ̀ bu ehi onye ka m'naraworo? ma-ọbu ìnyinya-ibu onye ka m'naraworo? ma-ọbu ònye ka m'meb͕uworo? ònye ka m'zọpiaworo? ma-ọbu n'àka onye ka m'naraworo ihe-nb͕aputa iji zopu anyam n'aru ya? m'gēnyeghachi kwa unu ya.


Sọl we gwa Jonatan nwa-ya na ndi-orù-ya nile okwu, ka ha me ka Devid nwua.


Ma Devid b͕alagara, wepuga onwe-ya, biakute Samuel rue Rema, gosi ya ihe nile Sọl mere ya. Ọ we je, ya onwe-ya na Samuel, ha we biri na Naiot.


Ọ si ya, Ya buru ihe-árú; i gaghi-anwu: le, nnam adighi-eme ihe uku ma-ọbu ihe ntà, ma ọ buru na o kpughepughi ntim ka m'nu ya: gini me-kwa-ra nnam ji zonarim ihe a? ọ bughi otú a.


Jonatan we za Sọl nna-ya, si ya, N'ìhi gini ka agēme ka ọ nwua? Gini ka o meworo?


Ma, nnam, le, e, le ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n'akam: n'ihi na nime nbipu m'bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi, ma eb͕ughm i, gi mara hu kwa na ọ dighi ihe ọjọ ma-ọbu njehie di n'akam, emehieghkwam megide gi; ma gi onwe-gi nāchu ntá nkpuru-obim iwere ya.


Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n'aru gi: ma akam agaghi-adi n'aru gi.


Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.


Devid we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēge nti okwu madu, si, Le, Devid nāchọ imejọ gi?


Ọ si kwa, N'ìhi gini kwa ka onye-nwem nāchu orù-ya n'azu? n'ihi na gini ka m'mere? ìhe ọjọ gini di kwa n'akam?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan