Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 2:36 - Bible Nso

36 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'ulo-gi gābia ikpọ isi ala nye ya n'ihi ego ntà nke ọla-ọcha na ob͕e achicha, ọ gāsi kwa, Biko, tiyem n'otù uzọ ọlu-nchu-àjà, ka m'we rie iberibe achicha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 2:36
9 Iomraidhean Croise  

Solomon we chupu Abaiata ka ọ ghara iburu Jehova onye-nchu-àjà; ka o we me ka okwu Jehova rè, bú nke O kwuru bayere ulo Ilai nime Shailo.


Nání na ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu adighi-arigo n'ebe-ichu-àjà Jehova nime Jerusalem, ma ha nēri achicha ekoghi-eko n'etiti umu-nne-ha.


Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu; Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume.


Unu asiwo kwa, Le, ka o si buru oké ike-ọgwugwu! unu afùwo kwa ya na nlelì, ka Jehova nke ndi-agha siri; unu ewebatawo kwa ihe anapuru n'ike, na ihe gwọrọ ngwuro, na nāria ọria; otú a ka unu webataworo onyinye-inata-iru-ọma: #M'gānara nka nke-ọma nāka-unu? ka Jehova siri.


Maika we si ya, Biri n'ulom, ghọ-kwa-ram nna na onye-nchu-àjà, mu onwem gēnye kwa gi ego ọla-ọcha iri kwa-arọ, na nke-ekike uwe, na ihe i gēji di ndu. Onye Livai we ba nime.


Ma M'gēme ka onye-nchu-àjà nke kwesiri ntukwasi-obi bilierem, ọ bu dika ihe si di nke di nime obim na nime nkpuru-obim ka ọ gēme: M'gēwu-kwa-ra ya ulo kwesiri ntukwasi-obi, ọ gējeghari kwa n'iru onye nkem etere manu ubọchi nile.


Nwata ahu, bú Samuel, we nējere Jehova ozi n'iru Ilai. Okwu Jehova we di oké ọnu na mb͕e ahu; ọ dighi ọhù ekwusara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan