Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 2:3 - Bible Nso

3 Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu; Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta: N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu, Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 “Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 2:3
26 Iomraidhean Croise  

Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, b͕aghara, me kwa, nye nwoke ọ bula dika uzọ-ya nile si di, onye I mara obi-ya; (n'ihi na Gi onwe-gi amawo obi umu madu nile, nání Gi;)


(Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume, Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)


Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne; Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu.


Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba: Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako.


Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i; Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume, Nime npako na nleda-anya.


Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a? N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.


Unu ebulila mpi-unu rue ebe di elu; Unu ejila olu kwesiri ike kwue oké okwu.


Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu: Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.


Uzọ nile nke onye ọ bula di ọcha n'anya-ya: Ma Onye nātùzi mọ nile nke madu ka Jehova bu.


Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a: Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta? Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama? Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?


Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.


Uzọ onye ezi omume nēso bu izi-ezi nile: Gi onye ziri ezi nēme ka uzọ onye ezi omume di lari.


Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.


Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.


Unu we were ọnu-unu me onwe-unu ka unu di uku imegidem, me ka okwu-unu ba uba imegidem: Mu onwem anuwo.


Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.


TEKEL; atùwo gi n'ihe-ọtùtù, hu na ihe kọrọ nime gi.


Okwu nile unu adiwo ike imegidem, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Gini ka ayi kwuritaworo megide Gi?


N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.


Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Ya onwe-ya mara, Israel kwa, ya onwe-ya gāmara; ọ buru na ọ bu nime nnupu-isi, ọ buru kwa na ọ bu nime nmekpu megide Jehova, (azọputala ayi ta,)


M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di.


Zebul we si ya, Òle ebe ọnu-gi ub͕u a, na i nāsi, Ònye bu Abimelek, na ayi gēfè ya òfùfè? Nkà abughi ndi nke i juworo? biko, pua ub͕u a, buso ha agha.


Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan