Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 2:27 - Bible Nso

27 Onye nke Chineke we biakwute Ilai, si ya, Otú a ka Jehova siri, Èkpugherem onwem n'ezie nye ulo nna-gi, mb͕e ha nọ n'Ijipt buru orù nye ulo Fero?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 2:27
14 Iomraidhean Croise  

Ma, le, onye nke Chineke siri na Juda bia n'okwu Jehova rue Bet-el: ma Jeroboam nēguzo n'akuku ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Solomon we chupu Abaiata ka ọ ghara iburu Jehova onye-nchu-àjà; ka o we me ka okwu Jehova rè, bú nke O kwuru bayere ulo Ilai nime Shailo.


Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ala Ijipt, si,


Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya:


Jehova we si Eron, Jerue ọzara izute Moses. Ọ we je, zute ya n'ugwu Chineke, sutu ya ọnú.


Nka bu kwa ngọzi ahu, nke Moses, bú onye nke Chineke, gọziri umu Israel tutu ọnwu-ya.


Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ.


N'ihi na ọ dighi amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mb͕e ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwue okwu, mb͕e Mọ Nsọ nēme ka ha kwue.


Nwayi ahu we bia, gwa di-ya, si, Onye nke Chineke biakuterem, n'ile ya anya ọ di kwa ka mọ-ozi nke Chineke n'ile ya anya, ọ di itu egwu nke-uku; ma ajughm ya ebe o si bia, o gosighkwam aha-ya:


na Jehova ziri otù nwoke, bú onye-amuma, jekuru umu Israel: ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka unu si n'Ijipt rigota, eme-kwa-ram ka unu si n'ulo ndi-orù puta:


N'ubọchi ahu M'gēme ka okwu nile M'kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu.


O we gabiga n'ugwu Efraim, gabiga kwa n'ala Shalisha, ma ha achọtaghi ha: ha we gabiga n'ala Shaalim, ma ha adighi n'ebe ahu: o we gabiga n'ala Benjamin, ma ha achọtaghi ha.


O we si ya, Biko, le, onye nke Chineke nọ n'obodo a, anāsọpuru kwa nwoke ahu; ihe nile ọ nēkwu aghaghi irè erè: ub͕u a ka ayi je n'ebe ahu; eleghi anya ọ gēgosi ayi uzọ-ayi nke ayi jeworo na ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan