Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 2:24 - Bible Nso

24 É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị banyere unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 2:24
16 Iomraidhean Croise  

O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ nna-ya, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.


n'ihi nmehie nile nke Jeroboam nke o mehiere, na nke o ji me ka Israel mehie; nime nkpasu-iwe-ya nke o ji kpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe.


Ma Jihu elezighi anya ijeghari n'iwu Jehova, bú Chineke Israel, n'obi-ya nile: o wezugaghi onwe-ya pua na nmehie nile nke Jeroboam, nke o jiri me ka Israel mehie.


Moses we si Eron, Gini ka ndi nka mere gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasi ha?


Ma unu onwe-unu ewezugawo onwe-unu n'uzọ Chineke; unu emewo ka ọtutu madu su ngọngọ n'iwu; unu ebibiwo ọḅuḅa-ndu Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ahuhu gādiri uwa site n'ihe di iche iche nēme ka madu ma n'ọnyà; n'ihi na ọ di nkpà na ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà nēsite n'aka-ya bia.


Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n'etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n'ọlu a di nkpà.


site n'otuto na ihe-ihere, site na nhota ọjọ na nhota ọma; dika ndi-nduhie, ma ayi bu ndi ezi-okwu;


Ma ọ ghaghi kwa inwe àmà di nma site n'ọnu ndi nọ n'èzí; ka ọ ghara idabà n'ita-uta, ya na ima n'ọnyà ekwensu.


N'ihi na, ebe ha nēkwu oké okwu na mbuli elu nke ihe-efu, ha were agu ikwa-iko di iche iche nārafu ndi ahu nime agu ihe ọjọ nke anu-aru, bú ndi nāb͕anari n'oge ub͕u a ndi nēbi obi na njehie;


Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie.


Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n'àjà nye arusi.


Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n'iru Jehova: n'ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova.


Ma Ilai emewo agadi nke-uku; o we nu ihe nile umu-ya ndikom nēme Israel nile, na otú ha nēso ndinyom ahu dina, bú ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.


O we si ha, N'ìhi gini ka unu nēme ihe dika ihe ndia? n'ihi na mu onwem nānu ihe ọjọ nile unu n'ọnu ndi nka nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan