Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 2:10 - Bible Nso

10 Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu; Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe: Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe; Ọ gēnye kwa eze-Ya ike, Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa. Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. “Ọ ga-enye eze ya ike bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 2:10
50 Iomraidhean Croise  

Jehova si n'elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da.


Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma ub͕u a, otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwé ewu na aturu, kuru gi, ka i buru nye-ndú ndim, bú Israel:


Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?


N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue: Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro.


O we me ka mpi ndi-Ya nwere di elu, Iburu ndi-ebere-Ya nile otuto; Bú umu Israel, ndi di nso Ya. Tonu Ja.


Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha, Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù, Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,


Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike N'elu Zaion, bú ugwu nsọm.


I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha; Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.


Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu; O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-Ya Za ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.


Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.


Jehova, n'ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu; Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi!


Jehova buru ya ike, Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu.


I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì: N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere gi Manu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi.


N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu: Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu.


Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya: Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.


M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri, Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.


N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo; N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.


N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche.


Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike, Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.


Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.


N'ihi na ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n'ikpé, ya na ihe ọ bula zoro ezo, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēji éb͕è-elu-igwe, ji kwa ala-ọma-jijiji, na oké olu, na oké ifufe na ikuku uku, na ire-ọku nke -ọku nērichapu erichapu, leta ya.


Le, n'ezi omume ka otù eze gābu eze, ndi-isi kwa, n'ikpé ziri ezi ka ha gābu ndi-isi.


Nání na Jehova ka ezi omume nile na ike di, (mu ka agwara okwu a): Ya ka madu gābiakute, ihere gēme kwa ndi ahu nile iwe-ha di ọku megide Ya.


N'ubọchi ahu ka M'gēme ka otù mpi puere ulo Israel, ọ bu kwa gi ka M'gēnye nsaghe-ọnu n'etiti ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa:


Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem.


O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputa N'ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid


Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum.


bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya.


n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi,


N'ihi na aghaghi ime ka ayi nile puta ìhè n'iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n'otù n'otù we nāghachi íhe esitere n'aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma.


Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova: Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya. Ala we di jū ọgu arọ abua.


Ma ub͕u a le eze nke unu rọputaworo, onye unu riọrọm n'aka: ma, le, Jehova emewo ka eze nāchi unu.


Ọ̀ bughi obìbì ọka wheat ta? M'gākpọku Jehova, Ọ gēnye kwa éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo; mara-kwa-nu hu kwa na ihe ọjọ unu riri nne, nke unu meworo n'anya Jehova, n'iriọrọ onwe-unu eze.


Samuel we kpọkue Jehova; Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo ubọchi ahu: ndi Israel nile we tua egwu Jehova na Samuel nke-uku.


Lem: b͕agidem àmà n'iru Jehova, na n'iru onye nke Ya etere manu: ọ̀ bu ehi onye ka m'naraworo? ma-ọbu ìnyinya-ibu onye ka m'naraworo? ma-ọbu ònye ka m'meb͕uworo? ònye ka m'zọpiaworo? ma-ọbu n'àka onye ka m'naraworo ihe-nb͕aputa iji zopu anyam n'aru ya? m'gēnyeghachi kwa unu ya.


Samuel we si ya, Jehova adọwapuwo ala-eze Israel n'aru gi ta, nye ya madu-ibe-gi, nke di nma kari gi.


Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom.


O rue, mb͕e Samuel nēsure àjà-nsure-ọku ahu, na ndi Filistia biaruru nso ibuso Israel agha: Jehova we were oké olu makwasi ndi Filistia éb͕è-elu-igwe n'ubọchi ahu, we me ka ha b͕a aghara; ewe tib͕ue ha n'iru Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan