Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 19:17 - Bible Nso

17 Sọl we si Maikal, N'ìhi gini ka i ghọb͕uworom otú a, we zilaga onye-irom, o we wepuga onwe-ya? Maikal we si Sọl, Ya onwe-ya sirim, Zilagam: n'ìhi gini ka m'gēme ka i nwua?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Sọl jụrụ Mikal sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?” Mikal zara, “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m pụọ, nʼihi gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 19:17
10 Iomraidhean Croise  

Ndi-orù Absalom we biakute nwayi ahu n'ulo, si, Òle ebe Ahimaaz na Jonatan nọ? Nwayi ahu we si ha, Ha agabigawo iyi miri. Ha we chọ, ma ha achọtaghi ha, ha we lata na Jerusalem.


Abnea we si kwa Asahel ọzọ, Si n'isom wezuga onwe-gi: nìhi gini ka m'gētib͕u gi rue ala? m'gēsi kwa aṅa weliere Joab nwa-nne-gi irum?


Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe.


Ya mere àghọwom onye-iro-unu, n'ihi na anamagwa unu ezi-okwu?


Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid, ma Maikal siri, Aru adighi ya ike.


Ndi-ozi ahu we bata, ma, le, terafim ahu di n'ihe-ndina, ákwà-ob͕ub͕o nke eji aji ewu me di kwa n'okpuru isi-ya.


Eze we si ndi-ọb͕a-ọsọ ndi nēguzo n'akuku ya, Chigharianu, me ka ndi-nchu-àjà Jehova nwua; n'ihi na aka-ha di kwa n'akuku Devid, na n'ihi na ha mara na onye nāb͕apu ka ọ bu, ma ha ekpughepughi ntim ka m'nu ya. Ma ndi-orù eze ekweghi isetipu aka-ha idakwasi ndi-nchu-àjà Jehova.


Nwayi ahu we hu Samuel, tie nkpu n'oké olu: nwayi ahu we gwa Sọl okwu, si, N'ìhi gini ka i ghọb͕uworom? n'ihi na gi onwe-gi bu Sọl.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan