Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 18:30 - Bible Nso

30 Ndi-isi ndi Filistia we puta: o rue, mb͕e ọ bula ha nāputa, na Devid nwere uche kari ndi-orù nile nke Sọl; aha-ya we di oké ọnu-ahia nke-uku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Ndịisi agha Filistia na-apụta ibu agha dịka ha na-eme mgbe ọbụla, ma Devid na-eme nke ọma karịa ndị ọchịagha Sọl ndị ọzọ niile. Nke a mere ka Devid ghọọ onye a mara aha ya nʼala ahụ niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 18:30
17 Iomraidhean Croise  

O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Devid zigara Joab, ya na ndi-orù-ya, na Israel nile; ha we bibie umu Amon, nọchigide kwa Raba n'agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem.


M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha uku, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.


Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n'ala n'iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n'anya-gi.


Ihe di oké ọnu-ahia n'anya Jehova Ka ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu.


Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche; N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche.


Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.


Ma n'okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n'aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n'ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri.


n'ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgaghi-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu.


Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;


Onye unu nābiakute, bú nkume di ndu, Nke madu juru n'ezie, ma n'ebe Chineke nọ Ọ bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru,


Ya mere ọ bu unu, bú ndi kwere ekwe, ka nsọpuru ahu diri: ma n'ebe ndi nādighi-ekwe nọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo;


Sọl we nātu egwu Devid kari; Sọl we buru onye-iro Devid ubọchi-ya nile.


Devid we nāpu je ebe ọ bula Sọl nēziga ya, o nwe-kwa-ra uche: Sọl we do ya onye-isi ndikom agha, o we di nma n'anya ndi Israel nile, di kwa nma n'anya ndi-orù Sọl.


Agha we di kwa ọzọ: Devid we pua, buso ndi Filistia agha, tib͕ue ha ntib͕u uku; ha we b͕apu n'iru ya.


N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm.


Sọl we si, Emehiewom: lata, nwam Devid: n'ihi na m'gaghi-emejọ gi ọzọ, n'ihi na ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi ta: le, emewom ihe-nzuzu, me kwa ihe nke-uku ri nne n'amaghi-ama.


Ma, le, dika ndu-gi di uku ta n'anyam, ka ndum di uku otú a n'anya Jehova, ka Ọ naputakwam na nkpab͕u nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan