2 Sọl we nara ya n'ubọchi ahu, o kweghi kwa ka ọ laghachi n'ulo nna-ya.
2 Sọl mere ka Devid nọgide nʼụlọeze. O kwekwaghị ka ọ laghachi nʼụlọ nna ya.
Ma Devid nējekuru Sọl, nēsi kwa n'ebe Sọl nọ laghachi, izù ìgwè ewu na aturu nna-ya na Bet-lehem.
Jonatan we kpọ Devid, Jonatan we gosi ya ihe ndia nile. Jonatan we me ka Devid biakute Sọl, o we nọ n'iru ya, dika na mb͕e gara aga.