Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 18:17 - Bible Nso

17 Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Sọl gwara Devid okwu sị ya, “Lee ada m nwanyị Merab. Aga m akpọnye gị ya, ka ị lụọ ya. Naanị jeere m ozi, lụọkwa agha Onyenwe anyị.” Nʼihi na Sọl kwuru nʼime obi ya sị, “Agaghị m ewelite aka m megide ya. Ka ndị Filistia mee nke ahụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 18:17
22 Iomraidhean Croise  

O we de n'akwukwọ ahu, si, Donu Uraia na ncherita-iru agha ahu nke siri ike kari, sinu n'iso ya la azu, ka ewe tib͕ue ya, o we nwua.


Gini mere i ji lelì okwu Jehova, ime ihe jọrọ njọ n'anya-Ya? i werewo mma-agha tib͕ue Uraia onye Het, nwunye-ya ka i werewo-kwa-ra n'onwe-gi na nwunye; ma ya onwe-ya, i werewo mma-agha umu Amon b͕ue ya.


O rue, mb͕e ib͕e Jehova batara n'obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēte kwa egwú, n'iru Jehova; o we leda ya anya n'obi-ya.


Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya: Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.


Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru, Ma nání agha ka obi-ya bu: Okwu-ya nile di nrò kari manu, Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.


Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua, Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ:


Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya; N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya.


Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya, Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.


N'ihi ya ka anāsi n'akwukwọ agha di iche iche nke Jehova, Vaheb nime Sufa, Na ndagwurugwu nile nke Anon,


Moses we si ha, Ọ buru na unu eme ihe a; ọ buru na unu ejikere onwe-unu n'iru Jehova ibu agha,


ma ndi-orù-gi gāgabiga, onye ọ bula nke ejikere iso usu-ndi-agha, n'iru Jehova ibu agha, dika onye-nwem nēkwu.


Moses we si ha, Ọ buru na umu Gad na umu Reuben eso unu gabiga Jọdan, onye ọ bula nke ejikere ibu agha, n'iru Jehova, ewe buda ala ahu n'iru unu; unu gēnye kwa ha ala Gilead ahu, ibu ihe-onwunwe:


Aka ndi-àmà gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n'ikpe-azu. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Ma umu-ndikom Sọl bu Jonatan, na Ishvi, na Malki-shua: aha umu-ya ndinyom abua kwa: aha nke ada-ya bu Mirab, aha nke-ntà bu Maikal:


Ndikom Israel we si, Ùnu ahuwo nwoke a nke nārigota? n'ihi na ọ bu ita Israel uta ka ọ nārigota: ọ gēru kwa, na nwoke nke nētib͕u ya, eze gēwere àkù uku me ka ọ buru ọgaranya, ọ gēnye kwa ya nwa-ya nwayi, me ka ulo nna-ya nwere onwe-ya n'Israel.


Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n'ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta.


ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n'ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n'aka-ayi.


Sọl we si, M'gēnye ya ya, ka o we ghọrọ ya ọnyà, ka aka ndi Filistia we di n'aru ya. Sọl we si Devid, Nke ub͕ò abua ka i gāburum di nwam ta.


Sọl we si, Otú a ka unu gāsi Devid, Ọ dighi ego-ilu-nwunye gātọ eze utọ, kama ọgu api ise nke ndi Filistia, ka o we bọrọ onwe-ya ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro eze. Ma Sọl chère ime ka Devid da ada n'aka ndi Filistia.


Devid we bilie, je, ya onwe-ya na ndikom-ya, o we tib͕ue ọgu ndikom iri n'etiti ndi Filistia; Devid we chita api-ha, ha we nye ha eze n'ọnu-ọgugu zuru ezu, ka o we buru di nwa eze. Sọl we nye ya Maikal nwa-ya na nwunye.


Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n'ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n'ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n'aru gi ubọchi-gi nile.


Devid we biarue Ziklag, zigara ndi-okenye Juda, bú ndi-eyì-ya, ufọdu nime ihe-nkwata, si, Le, ihe-ngọzi unu gēnwe sitere n'ihe-nkwata nke ndi-iro Jehova;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan