Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 18:14 - Bible Nso

14 Devid we nēnwe uche n'uzọ-ya nile; Jehova nọye-kwa-ra ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma, nʼihi na Onyenwe anyị na-anọnyere ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 18:14
18 Iomraidhean Croise  

Ọ dighi ihe ọ bula onye-isi ulo-nkpọrọ ahu nāhu nke di n'aka-ya, n'ihi na Jehova nọyere ya; ihe nke ya onwe-ya nēme, Jehova mere ka ọ ga nke-ọma.


Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nọye-kwa-ra ya.


Jehova nọye-kwa-ra ya; n'ebe o bula ọ nāpu o nwere uche: o we nupu isi n'okpuru eze Asiria, o fèghi kwa ya òfùfè.


O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.


Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs; Siria we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.


Jehova we nọyere Jehoshafat, n'ihi na o jere ije n'uzọ mbu Devid, bú nna-ya, ọ chọghi kwa Bealim;


M'gēnwe uche n'uzọ zuru okè: Òle mb͕e I gābiakutem? M'gējeghari n'etiti ulom n'izu-okè nke obim.


Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


n'ihi na Mu onwem nọyere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula gādakwasi gi ime gi ihe ọjọ: n'ihi na enwerem ọtutu madu n'obodo a.


Jehova we nọyere Joshua: akukọ-ya we di n'ala ahu nile.


Jehova nọye-kwa-ra Juda; o we nweta ugwu; ma ọ pughi inapu ndi bi na ndagwurugwu ala-ha, n'ihi na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè.


O gēru kwa, mb͕e ihe-iriba-ama ndia biaruru gi aru, gi mere onwe-gi dika aka-gi si chọta; n'ihi na Chineke nọyere gi.


Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n'okwu, buru kwa nwoke mara nma n'aru, Jehova nọye-kwa-ra ya.


Sọl we hu na nwoke ahu bu onye nēnwe uche nke-uku, o we tua ujọ ya.


Agha we di kwa ọzọ: Devid we pua, buso ndi Filistia agha, tib͕ue ha ntib͕u uku; ha we b͕apu n'iru ya.


Samuel we tó, Jehova nọye-kwa-ra ya, Ọ kweghi kwa ka okwu da n'ala sitere n'okwu-ya nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan