Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 17:53 - Bible Nso

53 Umu Israel we si n'ichusi ndi Filistia ike lata, ha we kwakọrọ ọmuma-ulo-ikwū nile ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

53 Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 17:53
7 Iomraidhean Croise  

onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n'ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n'azu nání iyipu ihe di n'aru ndi eb͕uru eb͕u.


N'ihi nka agēripia ndi nile nēripia gi; ọzọ, ndi nile ndi nākpab͕u gi, ha nile, na ndọta-n'agha ka ha gāla; ndi nāpunara gi ihe gāghọ ihe apunaraworo n'aka madu, ọ bu kwa ndi nile nke nāluta ihe-gi n'agha ka M'gēnye ka ha ghọ ihe-nluta-n'agha.


Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.


Ndikom Israel na Juda we bilie, tie nkpu, chua ndi Filistia, rue ebe i nābà Gai, ru kwa ọnu-uzọ-ama Ekron. Ndi Filistia ndi emeruru aru we da n'uzọ Shaaraim, we rue Gat, ru kwa Ekron.


Devid we būru isi onye Filistia ahu, bubata ya na Jerusalem; ma ọ tọb͕ọrọ ihe-agha-ya n'ulo-ikwū-ya.


n'ihi na o tiyere ndu-ya n'ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n'ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n'efu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan