Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 17:50 - Bible Nso

50 Devid we were èbè, were kwa nkume, kwa onye Filistia n'ike, o we tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua; ma mma-agha adighi n'aka Devid.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

50 Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 17:50
9 Iomraidhean Croise  

O we huta ọkpukpu-àb͕à ọhu nke inyinya-ibu, setipu aka-ya, jide ya, were ya tib͕ue nnù ndikom abua na ọgu iri.


Mb͕e ọ gasiri Shamga nwa Anat we di, nke were ndudu eji achu ehi tib͕ue ndi Filistia, nnù ndikom na ọgu iri: ya onwe-ya kwa, ọ zọputara Israel.


O rue, n'ubọchi agha, na ahutaghi mma-agha ma-ọbu ube n'aka onye ọ bula n'etiti ndi soro Sọl na ndi soro Jonatan: ma ahutara n'aka Sọl na n'aka Jonatan nwa-ya.


Devid we kekwasi mma-agha-ya n'uwe-nwuda-ya, we jisie ike ije; n'ihi na ọ nwaghi ya. Devid we si Sọl, Apughm iwere ihe ndia je; n'ihi na anwaghm ha. Devid we yipu ha n'aru ya.


Devid we setia aka-ya tiye n'àkpà-ya, weputa otù nkume nime ya, ma ya, mata onye Filistia ahu n'egedege-iru-ya; nkume ahu we bamìe n'egedege-iru-ya, o we da kpue iru-ya n'ala.


Devid we b͕a ọsọ, guzo n'elu onye Filistia ahu, were mma-agha-ya, miputa ya n'ọbọ-ya, me ka ọ nwua, ọ were ya bipu isi-ya. Ndi Filistia we hu na dike-ha anwuwo, ha we b͕alaga.


n'ihi na o tiyere ndu-ya n'ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n'ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n'efu?


Onye-nchu-àjà we si, Mma-agha Gọlaiat, bú onye Filistia, onye i tib͕uru na ndagwurugwu Ila, le, nke ahu di, afuchiworo ya n'ákwà n'azu ephod: ọ buru na i gēwere nke ahu, were ya: n'ihi na ọ dighi ọzọ di n'ebe a ma-ọbughi ya. Devid we si, Ọ dighi nke di ka ya; nyem ya.


Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n'ihi na unu enwewo ọmiko n'arum.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan