Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 17:47 - Bible Nso

47 ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n'ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n'aka-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

47 Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na Onyenwe anyị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke Onyenwe anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 17:47
15 Iomraidhean Croise  

O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.


Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


Ma n'aru ulo Juda ka M'gēnwe obi-ebere, M'gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M'gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha.


O we za, gwam okwu, si, Nka bu okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, si, Ọ bughi site n'usu-ndi-agha, ọ bughi kwa site n'ike, kama ọ bu site na Mọm, ka Jehova nke usu-ndi-agha siri.


Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?


É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya.


Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi.


Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole.


Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan