Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 17:46 - Bible Nso

46 Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

46 Taa ka Onyenwe anyị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 17:46
30 Iomraidhean Croise  

ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi.


Ahimaaz we kpọ òkù, si eze, Udo. Ọ kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke-gi, bu, Onye mechibidoworo ndikom ahu ndi weliri aka-ha imegide onye-nwem, bú eze.


Rizpa nwa-nwayi Aia we chiri ákwà-nkpe, b͕asara onwe-ya n'elu oké nkume, site na nmalite owuwe-ihe-ubi rue mb͕e esi n'elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kweghi kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n'ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n'abali.


Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke m'wuworo.


ka ndi nile nke uwa we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; onye ọzọ adighi.


Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, biko, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke, nání Gi.


O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.


I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro; I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.


Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa.


ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile.


Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi.


Jehova ab͕abawo ogwe-aka-Ya di nsọ ọtọ n'anya mba nile; nsọtu nile nke uwa we hu nzọputa nke Chineke-ayi.


Unu anu ọhia nile, bianu iri ihe, unu anu nile di n'oké ọhia.


M'gāwusi kwa ndum-ọdu Juda na Jerusalem n'ebe a dika miri; M'gēme kwa ka ha da site na mma-agha n'iru ndi-iro-ha, na site n'aka ndi nāchọ ndu-ha: M'gēnye kwa ozu-ha iburu anu-ufe nke elu-igwe, na iburu anumanu nke uwa, ihe-oriri.


M'gēwere ha nye n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ozu-ha ewe ghọrọ anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anu-ọhia nke uwa, ihe-oriri.


Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a.


N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, na ndi ọ bula, ma-ọbu mba ọ bula, ma-ọbu asusu ọ bula, nke gēkwuhie megide Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego, agābọkasi ya, ọ bu kwa ulo-ya ka agēme ebe-ikpofu-ahihia: n'ihi na ọ dighi chi ọzọ nke puru inaputa otú a.


Ebe ọ bula ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ.


Ozu-gi gābu-kwa-ra anu-ufe nile nke elu-igwe, bu-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri, onye-nchuli adighi kwa.


mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāra kwa ha nye n'iru gi, i we tib͕ue ha; i gēwezugasi kwa ha ka ebibie ha; gi na ha ab͕ala ndu, eme-kwa-la ha amara:


Ma Jehova, bú Chineke-gi, gāra ha nye n'iru gi, me kwa ka ha b͕a aghara uku, rue mb͕e agēkpochapu ha.


Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi.


ka ndi nile nke uwa we mara aka Jehova, na ike ka ọ di; ka ha we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile.


Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole.


Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m'were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan