Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 17:12 - Bible Nso

12 Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ma Devid bụ nwa Jesi, onye Efrat nke Betlehem dị na Juda. Jesi mụtara ndị ikom asatọ. Nʼoge nke Sọl, ọ ghọọla agadi nwoke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 17:12
18 Iomraidhean Croise  

Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).


Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid. Ihe nke si n'ọnu Devid nwa Jesi puta, Na ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie, Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu, Na onye nwere olu di utọ n'ibù abù ọma Israel:


Le, ayi nuru okwu bayere ya n'Efrata: Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia.


Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Jesi we mua Devid, bú eze. Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia;


Ma mb͕e amuru Jisus na Betlehem nke Judia n'ubọchi Herod, bú eze, le, ufọdu ndi mara ihe, ndi sitere n'Ọwuwa-anyanwu, biaruru Jerusalem,


Gi Betlehem kwa, ala Juda, I dighi nke-ntà kachasia n'etiti ndi-isi Juda ma-ọli: N'ihi na n'etiti gi ka Onye-isi gāputa, Onye gāzù ndi nkem Israel dika aturu.


Aha nwoke ahu bu Elimelek, aha nwunye-ya bu Naomi, aha umu-ya ndikom abua bu Mahlon na Kilion, ndi Efrat nke Bet-lehem-juda. Ha we ba n>ala-ọhia Moab, nọ n>ebe ahu.


Ndinyom, b/u ndi-ab͕ata-obi-ya, we kpọ ya aha, si, Amuru nwa-nwoke nye Naomi; ha we kpọ aha-ya Obed: onye ahu bu nna Jesi, nna Devid.


Obed we mua Jesi, Jesi we mua Devid.


Ma otù nwoke nke Ramataim-zofim, nke ugwu Efraim, di, aha-ya bu Elkena, nwa Jeroham, nwa Elaihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Efrata:


Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom.


Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n'okwu, buru kwa nwoke mara nma n'aru, Jehova nọye-kwa-ra ya.


Sọl na Israel nile we nu okwu nile ndia nke onye Filistia, ha we tua ujọ, tua egwu nke-uku.


Sọl we si ya, Nwà onye ka i bu, gi nwa-okorọbia? Devid we si, Nwa orù-gi, bú Jesi, bú onye Bet-lehem, ka m'bu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan