Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 16:5 - Bible Nso

5 Ọ we si, Ọ bu n'udo: ichuru Jehova àjà ka m'biaworo: donu onwe-unu nsọ, sorom bia n'ichu-àjà ahu. O we do Jesi na umu-ya ndikom nsọ, kpọ ha bia n'ichu-aja ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma Samuel zara ha sị “E, udo dị, Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja. Doonụ onwe unu nsọ bịa soro m gaa ịchụ aja ahụ.” O dokwara Jesi na ụmụ ya ndị ikom nsọ, gwakwa ha ka ha soro gaa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 16:5
16 Iomraidhean Croise  

Jekob we si ulo-ya, ọ si kwa ndi nile ya na ha bi, Wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'etiti unu, menu onwe-unu ka unu di ọcha, b͕anwe-kwa-nu uwe-unu:


Adonaija nwa Hagit we biakute Bat-sheba nne Solomon. Ọ si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo? Ọ si, Ọ bu n'udo.


Mọ nke Chineke we yiri Amasai, bú onye-isi ndi-ọchi-agha ahu, dika uwe, o we si, Nke gi ka ayi bu, Devid, n'akuku gi ka ayi nọ kwa, nwa Jesi: udo, udo diri gi, udo di-kwa-ra onye nēyere gi aka; n'ihi na Chineke-gi enyeworo gi aka. Devid we nara ha, me ha ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe.


O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.


Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha,


menu ka ndi Israel zukọta, donu nkpọkọta Israel nsọ, chikọtanu ndi-okenye, menu ka umu-ntakiri na ndi nāṅu ara zukọta: ka onye nālu nwunye ọhu si n'ime-ulo-ya puta, ka nwunye ọhu si kwa n'ulo-ndina-ya puta.


Dere du n'iru Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ubọchi Jehova di nso: n'ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ.


Ndi Israel jeghariri, chikọta ya, were nkume-igwe-nri gwe ya, ma-ọbu na ha suru ya n'ikwè, we sie ya n'ite, me ya ka ọ buru ob͕e achicha: idetu ya ire ọ di ka idetu ihe eji manu si esi.


Ma ka madu nwaputa onwe-ya, otú a ka o ri kwa nime achicha ahu, ṅu kwa nime iko ahu.


Joshua we si ndi Israel, Donu onwe-unu nsọ: n'ihi na echi ka Jehova gēme ihe-ebube di iche iche n'etiti unu.


Bilie, do ndim nsọ, si, Donu onwe-unu nsọ bayere echi: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ihe ewezugara nyem di n'etiti gi, Israel: i pughi iguzosi ike n'iru ndi-iro-gi, rue mb͕e unu gēwezuga n'etiti onwe-unu ihe ahu ewezugara nyem.


Ma Sọl ekwughi ihe ọ bula n'ubọchi ahu: n'ihi na ọ siri, Ihe-ndabà ka ọ bu; onye nādighi ọcha ka ọ bu; n'ezie ọ dighi ọcha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan