Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 16:21 - Bible Nso

21 Devid we biakute Sọl, guzo n'iru ya: o we hu ya n'anya nke-uku; o we ghọrọ ya onye nēbu ihe-agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 16:21
13 Iomraidhean Croise  

Josef b͕ara orú arọ na iri mb͕e o guzoro n'iru Fero eze Ijipt. Josef we si n'iru Fero pua, gabiga n'ala Ijipt nile.


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi.


Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi.


Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha, Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.


Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu, ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu: N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe; Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.


Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya; Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.


Joshua nwa Nun, nke nēguzo n'iru gi, ya onwe-ya gābà n'ebe ahu: gi me ya ka ọ di ike; n'ihi na ya onwe-ya gēme ka Israel keta ya.


Na mb͕e ahu ka Jehova kewaputara ebo Livai, ibū ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iguzo n'iru Jehova ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue ta.


O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m'nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua.


Sọl we zigara Jesi ozi, si, Biko, ka Devid guzo n'irum; n'ihi na ọ hutawo amara n'irum.


Ma Devid nējekuru Sọl, nēsi kwa n'ebe Sọl nọ laghachi, izù ìgwè ewu na aturu nna-ya na Bet-lehem.


Ma mb͕e Sọl huru Devid ka ọ nāpu izute onye Filistia ahu, ọ siri Abnea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, Abnea, nwà onye ka nwa-okoro nka bu? Abnea we si, Nkpuru-obi-gi nādi ndu, eze, amaghm.


Jonatan we kpọ Devid, Jonatan we gosi ya ihe ndia nile. Jonatan we me ka Devid biakute Sọl, o we nọ n'iru ya, dika na mb͕e gara aga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan